Dike Alaa Mmụọ (Chukwuemeka Ike) Poem by Izunna Okafor

Dike Alaa Mmụọ (Chukwuemeka Ike)



Dike Alaa Mmụọ (Chukwuemeka Ike)



Izunna Okafor dere abụ a



Gém gém gém gém!
Dùm dùm dùm dùm
Tìkó tìkó tìkó tìkó
Gbám gbám dùm dùm.

Ùgbòrò abụọ ka òkù na-akpọ dike
Ọ kpọọ ya na ndụ, ọ kpọọ ya n'ọnwụ
Ihe emeghị n'ízù, o mee n'ọnwa
Maka na isi gbàá ahọ, chaa áwọ,
Nwa onye ụwa ga-azarịrị chi ya òkù.

Ụzụ tụọ n'ili dike
Ọha mmụọ na ọha mmadụ anụ ísì ozu ya
Maka na ọ na-abụ ekwe kụọ
Àmà agbaa.

Ọ bụ gịnị na-afịọ?
Oke mmiri àtáálá n'udummiri
Ihe mèrè na Ndịkeliọnwụ
Oke mmadụ ebuláálá akwụkwọ

Gìdì gìdì gìdì
Kotìko dùm dùm dùm
Chaị! íbo èzéé n'obí ézè
Ebubedike alaa mmụọ

Gịnị ka a na-ekwubèdị ihe a?
Chukwuemeka Ike àpàchiela anya
Eze Ndikeliọnwụ ejebego obodo afụdobe
Izùtè ndị mbụ na ndị ègèdè n'ọhà mmụọ.

Ihe emee n'obi eze
Ọ na-abụ ézè azụ kakpụọ
Ọ si òsìmìrì lọta
Onye ije alakwúrú chi ya.

Chukwuemeka bụ dike ụbụrụ nkọ
Ọkaibe n'ọhịa edemede
Ọkammụta nwere ùgwù
Chaị! eze obi umeala alakpuo ụra.

Ihe ala rìrì àkárịá
Ya dịba, maka na ụwa a bụ ahịa
Onye zụcha nke ya, ọ laba
Chukwuemeka Ike ladị mma.

Kókó kókó tìkó tìkó
Dùm dùm kótì
Eze, ka mkpụrụ obi gị zùru ike udo
Ụbọchị nkwọ ka anyị zụkọọ ọzọ n'ọhà mmụọ
Onye ije ladị mma.

Dike Alaa Mmụọ (Chukwuemeka Ike)
Friday, April 24, 2020
Topic(s) of this poem: death,dirge
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success