Ehi Igbo Poem by Izunna Okafor

Ehi Igbo

Izunna Okafor dere abụ a


Pòkòpòkò ka ọ na-ézè
N'anya Chukwu na n'anya mmadụ
Ihe dị mma na anya gbàrà
Ị hụkwàrà anụ na mma
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Lekene ụyọkọtọ ara ya
Na àkpàkwùrù amụ ndị bụ óké
Ìtè afọ ya, na àpàtà ụkwụ ya
Ihe ndị a niile bụcha anụ anụ
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ọ naghị achọ nwoke okwu
Nke o ji achọ nwaanyị
Ọ naghị ebíbì ihe a kọrọ n'úgbō
Ma ya fọdụzie ịràkọ mmadụ na onye nwe ya
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ehi Igbo anaghị eri óké egō
Mana úrù ya kàrịrị nke ndi ngō
Ịzụ ya anaghị ewèta ihe arụ
Maka na onye nwe ya ñụjùrù mmiri ara afọ
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ehi Igbo na-amụ nwa juru eju
Ụmụ ya na-etokwa ọsọọsọ
Ehi Igbo na-agba óké anụ
Anụ ya bụkwa ezigbo ihe ụtọ
Ehi Igbo ka ọ bụ

Ehi Igbo anaghị anwụ hịam
Dịka nke ndị ngō
Ọ bụghị ọrịa niile na-atụkwa ya
Maka na onye nwe ya ma ihe o jìrì zụọ ya
Ehi Igbo ka ọ bụ

Ehi Igbo achọghị AK47
Ehi Igbo achọghịkwa RUGA
Maka na agbụgbọ dị ya ahụ mma
Ehi Igbo bụ anụ ụlọ
Ehi Igbo ka ọ bụ

Ehi Igbo na mmadụ anaghị akwàkọ iko
Maka na nke ahụ bụ ihe arụ
Ehi Igbo anaghị àwá isi
Okwu na ụka abụghịkwa njirimara ya
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ehi Igbo dị mfé ọkpụkpa
Ehi Igbo na-agbasi ike
Ehi Igbo na-adị ọcha
Ehi Igbo bụkwa sọ mma
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ụmụ Igbo zụbanụ ehi Igbo
Ụmụ Igbo ribenụ ehi Igbo
Maka na nke a bụ nke anyị
Ehi Igbo atọgbuo m
Kpọọ nụ ya ehi Igbo...
Ehi Igbo...


©Izunna Okafor,2019.

Ehi Igbo
Monday, August 5, 2019
Topic(s) of this poem: epic
POET'S NOTES ABOUT THE POEM
Maka Onye Dere Abụ A

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016; Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ na-arụ n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra, ma na-arụkwa n'ụlọ ọrụ Igbo Radio, bụ ụlọ ọrụ dị n'ikùkù ma nwee isi ngàlàbà ya na mba Canada.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success