Chuka Nnabuife: Nwoke Na Mma Poem by Izunna Okafor

Chuka Nnabuife: Nwoke Na Mma



Chuka Nnabuife: Nwoke Na Mma


(Abụ pụrụ iche maka mmemme ncheta ọgbụgba ahọ iri ise nke Sa Chuka Nnabụife)


Izunna Okafor dere abụ a


A sị na mma nwoke bụ mpempe akwụkwọ
Mana nke ahụ bụ maka ndị ụjọ akwụkwọ
Maka na onye gụtụ akwụkwọ, ma o kweghị ya
Mgbe ahụ, ọ sị ka ọ ga bute ego
Maka na ị kpazie ya aka n'ọnụ, ọ sị na ego bụ mma nwoke


Ụfọdụ sịkwa na ogologo imi bụ mma nwoke
Mana nke ahụ bụ maka ndị jọtara ọnụ ha
Onye lechaa onwe ya n'enyo, hụ na ọ dị ka isi mkpi
Mgbe ahụ, o cheta na ogologo imi bụ mma nwoke
Maka na ya onwe ya bụ ụsụ ohu imi


Ndị Ọka sịkwa na mma nwoke bụ n'afọ ọnụ
N'ihi na ha onwe dịka ihu mmụọ
Ego kwàrà ha, ogologo imi erughịkwa ha aka.
Ha wee ghàdozie aka n'afọ ọnụ
We kwubezie na afọ ọnụ bụ mma nwoke

N'ime ihe ndị a niile
Nke bụ eziokwu bụ na ọha obodo maara mmụọ ka ukwu
Maka na e jighị nkume elele isi kara aka
Ngàla nwa ebuli bụ n'ihe chi ya jiri gọzịe


Mana ka m mme ka ị mara
O nwere otu nwoke nwere ihe ndị a niile
Ọ bụ maazị Chuka Nnabụufe
Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ akwụkwọ
Kama ogologo imi ya ha ka nke ele
Afọ ọnụ ya hakwa ka nke agụ
Mpe mpe akwụ na-esi juputakwara n'akpa ya
Maka na a sị onye ji ya ruru abụọ, ya gwuru

Lekene nwoke na mma
Ọ bụ ogologo o toro ka ọnụ nkwụ
Ka ọ bụzị ọtụtụ akara chi jiri gọzie ya
Ndị be anyị, a na-ekedị oke ji n'azụ ọba?


Ị chọọ ya n'ịgba mbọ, ị hụ ya
Ị chọọ ya n'ise ihe, ị hụ mkpịsị aka ya
Ị nwaa ya n'egwu, ị hụ na ọ bụ keleke
Ị chọzie ya n'ihe odide, ị hụ na ya na Achebe bụ ofu nne
Ọrụ mgbasa ozi bụzịkwaara ya mmiri ọñụñụ


Afọ ọma ya na-akpụ n'ala ka nne eke
Ọ bụ nwoke maara ezi okwu
Ọgụgụ isi bụkwaara uhie ọnụ
Oge ọbụla, ihu na-atọ ya amụ ka ọkịrị nnewi
Maka na ọ ghọtara n'elu ụwa dịka ahịa otu
N'ihi ya keduzị ihe mmadụ na-echegburu onwe ya.


Ndị be anyị, keduzị ebe anyị ga-ebido wee gụsịba
Ọ bụ ndị o mere eme ka ọ bụ ndị ọ ka na-eme eme
Ọ bụ na ndị o buru pụta ụwa
Ka ọ bụ na ndị ọ rụtaara onwe ya
N'eziokwu, a dịghị ama ọgaranya n'afọ nto
Maka na oke ji n'abala adịghị azọ ihu ọba
Maazị Chuka bụ oke nwoke
Ka m ka gbado ya ebe a maka mgbe ọzọ
Maka na oke mmụọ nọkarịa n'ọgbọ
Ụmụọkpụ ekenye ya ụtụ



© Izunna Okafor,2018.

Chuka Nnabuife: Nwoke Na Mma
Friday, April 24, 2020
Topic(s) of this poem: birthday
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success