Onye Akwụkwala Ụdọ Poem by Izunna Okafor

Onye Akwụkwala Ụdọ

Izunna Okafor dere abụ a



Gém gém gém gém!
Dùm dùm dùm dùm
Tìkó tìkó tìkó tìkó
Gbám gbám dùm dùm.

Ụzụ akwa na-atụ
Ọ bụ gịnị na-afịọ
Nwa nke mmadụ anwụọla
Mana ọ bụghị ọnwụ gburu ya.

Gịnị na-èkwòzị
Ịkwụ ụdọ na-ekwò
Anyammiri na-ezò
Mkpu akwa na-akpọ

Onye ọbụla na-agba ụrịọm
Ndị asụmmiri na-abụ
Ọtụtụ na-adụ n'ùbú
Ọtụtụ ekweghịkwa abịarute nso
Cha! Ihe arụ mèrè

Ótù ihe mere
Mana ihe atọ ka a na-akwara akwa
Otu onye mere ya
Mana ọtụtụ ka nke ahụ metụtara

Gịnị bụdị ihe atọ a na-akwara akwa?
Mmadụ nwụrụ, nke ahụ otu
Arụ mere, ọ bụrụ abụọ
Ihe ichu aha dakwàsịrị ndị dị ndụ
Nke ahụ ga-adịkwa ọkpụtọrọkpụ

Ịkwụ ụdọ bụ ihe arụ
Ma n'anya chukwu
Ma n'anya mmadụ
Akụkọ ya agaghị akọchakwa akọcha
Maka na ọ na-abụ nwata tote ọ nụrụ

Ịkwụ ụdọ abụghị usoro kacha mma
Ịkwụ ụdọ abụghị ejechaa ọgwụ
Ịkwụ ụdọ anaghị enyekwa ezumike
Maka na onye kwụrụ ụdọ n'eje ọkụ mmụọ
Ebe ọ ga-anọ hụ nke bụ ahụhụ anya

Onye gburu onwe ya egbughịnụ ọchụ
Mana ihe o gburu karịrị ihe gburu ya
Onye o ribìdòrò kọtara nwanne ya
Maka na ọ na-abụ nnụnụ mechie ọnụ ya
Agụụ egbughị ya, akpala afụchie ya ikè.

Onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ
O mee mee ọ hụ ahụ
Agadi nwaanyị kachie ntị wụọ aja
E bute ozu ya n'ofè nke ọzọ
Arịọ m ụnụ niile:
Onye akwụkwala ụdọ.



©Izunna Okafor,10/9/2020
(for World Suicide Prevention Day)

Title translation >>>Let No One Commit Suicide.

Onye Akwụkwala Ụdọ
Friday, September 11, 2020
Topic(s) of this poem: didactic
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success