Biafra Biko Bianụ! (Igbo) Poem by Emmanuel Aneto

Biafra Biko Bianụ! (Igbo)



Biafra biko bianụ!
Obodo ọma nke ụmụchineke
Ala Ihe ọma niile ekere eke
Ebe agaghi enwe ịkpa oke

Biafra biko bianu!
Dị ka Kpakpando ị ga-achake
Ebe ngọzi gị si n'aka Chiokike
Ụmụ gị ga-adị ọgọ dị ka akwaeke

Biafra biko bianụ!
Ụmụ Igbo na-efegharị obodo niile dị ka eneke
Ọtụtụ ndị ntorobia na-awụzi ọnwu ike
Biko bianụ! ka anyi laa ụlọ ga zuru ike

Biafra biko Bianụ!
Ndị agha gbara egwueke n'ụlọ Ọhamadike
Ha gburu ma Okafọ ma Okereke
Ha gburu ma Mgbafọ ma Mgbeke

Biafra biko bianụ!
Ndi iro na-emesi anyị ike
Ha na-achọ ka anyi mee ya n‘aka ike
Mana anyị ji ndidi na mgbasiike

Biafra biko bianụ!
Bia n‘nkwọ orie afọ ma ọ bụ eke
Nwere oke Ikuku egbeigwe na opiike
Kulie! Mmụọ na Ọbara ụmụaka egburu n‘ike
Kulie! ndi niile nwụrụ n'agha bia zanụ Ọjadike

Biafra biko bianụ!
Ndị ọcha biara kuziere anyi okwu bekee
Nne na Nna na-asụziri ụmụ ha sọsọ bekee
Ụmụada anyi na-azazi Ada bekee
Ụmụokorobia na-achọzi ọrụ bekee

Biafra bikonụ biawazienụ!
Igbo niile na ndị agbataobi ha na-achọsi gị ike
ka nzukọ ụmụ agwọ bụrụ n‘obi eke
n‘okpuru Nnamdị Kalụ Ọhamadike!

Iseeeeeeeeee!


(In commemoration of the Nigerian-Biafran war 1967-1970)

Sunday, May 31, 2020
Topic(s) of this poem: elegy
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success