Agu n'eri enwe! O mu
Ikuku ama na onya! O mu
O bukwanu agu ji egbe! O mu
Onya jide Ikiri o tugharia jide onya
Ikiri Dinta gbagburu n'egbe kedoro aka
Na osisi karia mgbe onwuchara rii
Dinta gbagburu Ikiri agbagbughi aka ya
Ma na alaka mpa osisi aka ya ji
Njo Ikiri erughi na itachi obi ya
Nke mere na ntachi obi Ikiri bu ike ya
Ikiri yiri oke chichipa ma nwe ihu usu
Mana obughikwa eziokwu na obi no ya na azu
A si na obu obi okwute nke Dinta ma ofuma
Onu nile ga ekwu nke masiri ha maka anya ufu ha
Igwe nmadu nile ndi achoghi oganiru nke Ikiri
Na agbanyeghi obere Ikiri di o bu oke osisi
Aham nke bu afam bu Ikiri Okohia ochi na nwata
Nke si ogbe Isiala we je ka Odumodu rue
N'obi ezi ulo aku nke Dogulasi no na owara owere
Nka we ju m anya nke uku mgbe mbatara n'ime ya
Nka mere ka nrachapu ofe nmanu nkwu okoro
Nke nwoke ofenmanu kusara na ala nyem na nzuzo
O we me ka akam gbuchapu na mpa osisi nkedoro
Aka mere ka mdapu we metu azu na ala na ogbo
Akpiri agbara nwoke ofenmanu si na-azu nyeruo m
O mere aka m we na agbu-agbu ka okoro mere ka m
Dapu site n'osisi oji we buru onye no na ala
Nkaa gbagojurum anya ino rue n'ubochi taa
Ikiri hapu osisi aka akpara ya
Ikiri anaghi eju akpa Dinta
Ma obu onu riri Ikiri ma na nwata na dimkpa
Ikiri rijuru afo we che chi ya aka mgba
Nmadu anaghi agbaso chi ya aka mgba
Ma na nmadu Chukwu kere abughi Ikiri
Ikuku ama na onya abughi Ikiri
O bu nani propaganda nke ndi obodo Naijiria
This poem has not been translated into any other language yet.
I would like to translate this poem