Ifeoma Poem by Chris Jibero

Ifeoma

Ifeoma
Nwanyi oma
I mara mma
Dika muo ozi oma
Ntutu isi wusa ka igurube
Ma odighi eji oke nji ka mbembe
Kama omere ka mma gi putakwuo ihe
N’ihi na i bu oke ihe
Nke gbara ochichiri gharii

Ifeoma
Nwanyi oma
Anya gi abuo n’amuke amuke dika kpakpando
N’egosi onye Chukwu goziri uzo ndu
Mgbe onwa nabara ura n’abali
Onu gi dikwa ka ibo eluigwe
Ahu gi na egbuke egbuke dika ola edo
Obi gi juputakwara n’udo
Dika ugwu nso abuo bu ebe ngbaba
Ndi n’enweghi ike
I chara acha dika udara
Ma ghekwa eghe dika akara
A makwa m na i ga di uto karia azu asa
Maka na ihe nwata toruru ogo ya abughi usa

Ifeoma
Nwanyi oma
Bia mepere m uzo oma
N’ihi na Chineke nyere gi
Igodo ndu oma
Ma wujukwa amara ya n’ime ndu gi
Ima mma gi bidokwara n’aha oma gi


Ifeoma
Nwanyi oma
Anyanwu ututu nwere ihu oma
Ihe di m ezi mma
N’ihe na i buso mma
A nokwala m ebe di anya
N; ihi na a huru m gi n’anya.

(c) Chris Jibero.

COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success